Amos 2

1Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,

“Nʼihi njehie atọ nke Moab,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ,
mee ha ka ha ghọọ ntụ.
2Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab,
nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt.
Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara,
nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike.
3Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi,
gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.”
Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu.
4Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,

“Nʼihi njehie atọ nke Juda,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị.
Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya.
Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie,
bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro.
5Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda,
ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.”

Ikpe ọmụma dịrị Izrel

6Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,

“Nʼihi njehie atọ nke Izrel,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha,
reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ.
7Ha na-azọpịa isi ndị ike na-adịghị,
na-echi ha ọnụ nʼaja,
na-ewezuga ndị dị umeala nʼụzọ ezi ihe.
Nwoke na nna ya na-edinakwuru otu nwaagbọghọ,
si otu a merụọ aha nsọ m.
8Ha na-edina nʼakụkụ ebe ịchụ aja ọbụla,
nʼelu uwe ndị anatara na mbe.
Nʼime ụlọnsọ chi ha,
ha na-aṅụ mmanya ha natara dịka ihe nra.

9“Ma a lara m ndị Amọrait nʼiyi nʼihu ha,
ndị ahụ dị ogologo dịka osisi sida,
ndị sikwara ike dịka osisi ook.
Alara m mkpụrụ ha dị nʼelu,
na mgbọrọgwụ ha niile dị nʼokpuru nʼiyi.
10Esitere m nʼala Ijipt kpọpụta unu,
duru unu gafee nʼọzara iri afọ anọ,
ime ka unu nweta ala ndị Amọrait.

11“Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma,
họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait.
Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya.
12“Ma unu mere
Maọbụ, kwagidere
ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya.
Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma.

13“Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu,
dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada.
14Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ,
ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume,
ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha.
15Ndị na-agba ụta agaghị agbata ihe ọbụla,
ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwekwa ike ịgba ọsọ.
Ọ bụladị onye ịgba ịnyịnya doro anya agakwaghị enwe ike ịgbanarị ihe mberede nke ga-abịakwasị ya.
16Ndị obi siri ike nʼetiti ndị dike unu,
ga-agbara ọtọ gbapụ ọsọ nʼụbọchị ahụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Copyright information for IboBIU